Chinụa Achebe
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Colonial Nigeria, Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Chinua Achebe |
Aha ọmụmụ | Albert Chinụalụmọgụ Achebe |
aha enyere | Albert |
aha ezinụlọ ya | Achebe |
ụbọchị ọmụmụ ya | 16 Novemba 1930 |
Ebe ọmụmụ | Ogidi |
Ụbọchị ọnwụ ya | 21 Maachị 2013 |
Ebe ọ nwụrụ | Boston |
ihe kpatara ọnwụ | disease |
Ebe olili | Ogidi |
Dị/nwunye | Christie Chinwe Okoli-Achebe |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa, Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
onye were ọrụ | Brown University, University of Nigeria |
ebe agụmakwụkwọ | University of London, University of Ibadan, gọọmentị kọleji Umuahia |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1958 |
Oge ọrụ ya (njedebe) | 2012 |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | People's Redemption Party |
agbụrụ | |
Ọnọdụ ahụike | paraplegia |
Ọrụ ama ama | Ihe Aghasaa, No Longer at Ease, Arrow of God, A Man of the People, Anthills of the Savannah |
Archive na | Houghton Library, University of Reading, Special Collections |
Onye òtù nke | Modern Language Association, American Academy of Arts and Sciences, Royal Society of Literature |
onye nlereranya | Okey Ndibe |
ahọpụtara maka | Booker Prize, Neustadt International Prize for Literature, Neustadt International Prize for Literature |
Chinụa Achebe Audio (site n'aha a gụrụ ya Albert Chinụalụmọgụ Achebe; 16 Nọvemba 1930 – 21 Maachị 2013) bụ onye Igbo a mụrụ n'ụbọchị nke iri na isii n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1930 n'obodo Ogidi nke dị n'ala Naijiria. Ọ bụ ya dere akwụkwọ a na-akpọ Things Fall Apart. E si n'akwụkwọ ahụ mara aha ya nke ukwuu n'ụwa nile.[1]
Ihe Gbasara Achebe
[dezie | dezie ebe o si]Chinụa Achebe, onye nke nne na nna ya kpọrọ Albert Chinụalụmọgu Achebe, gara ụlọ akwụkwọ nta nke ndị uka, gakwaa Government College n'Umuahia. Ọ mechara gakwaa mahadum nke Ibadan University of Ibadan, Ȯra Ọyọ (Oyo State) ebe ọ gụrụ asụsụ békè' site n'afọ 1948 ruo afọ 1953. Ka ọ gụchara akwụkwọ nke mahadum, ọ rụtụkwara ọrụ n'ụlọakwụkwọ dị iche iche nakwa n'ụlọọrụ mgbasa ozi. Site na 1958 ruo 1966, Chinụa Achebe bụ onye nhazi na-ahụ maka African Writers Series.
Mgbe Achebe dere Things Fall Apart, akwụkwo ahu rere nke ukwuu, mkpụrụ nde iri. A tụgharịkwaala akwụkwụ a n'olu asụsụ iri ise.
Chinụa Achebe rụkwara ọrụ onye diplomat n'ọchịchị nke Biafra site na 1967. Mana site na 1967 ruo 1981, ọ kụzikwara na mahadum dị iche iche n'ala Naijiria, ma bụrụkwa onye nhazi maka akwụkwọ edemede nke a na-akpọ Okike. N'afọ 1981, Chinụa Achebe sokwa na ndị bidoro Otu Ndi Odee Nke Naijiria, nke a na-akpọ Association of Nigerian Authors. Ọ rụkwara ọrụ onye isi were ruo 1986.
A bịa n'etiti Ndị Nka, yaa bụ ndị na-ede edemede nke Modern African Literature, ihe a na-akpọ Chinụa Achebe bụ Nna. N'afọ 2002 ka e nyere ya Peace Prize nke German Book Trade. A makwa Chinua Achebe dị ka onye na-enweghi onye e ji atụnyere ya maka ịmalite edemede n'asụsụ bekee' n'akụkụ ọdịda anyanwụ n'ala Afrịka.
Ọ luru nwanyi; aha nwunye ya bụrụ Christiana Chinwe Okoli.
Ihe Ndị O Dere
[dezie | dezie ebe o si]Novels
[dezie | dezie ebe o si]
|
Short Stories
[dezie | dezie ebe o si]- The Sacrificial Egg and Other Stories, 1962
- Civil Peace, 1971
- Girls at War and Other Stories, 1973
- African Short Stories (editor, with C.L. Innes), 1985
- Heinemann Book of Contemporary African Short Stories (editor, with C.L. Innes), 1992
Poetry
[dezie | dezie ebe o si]- Beware, Soul-Brother, and Other Poems, 1971 published in the US as *Christmas at Biafra, and Other Poems, 1973
- Don't let him die: An anthology of memorial poems for Christopher Okigbo (editor, with Dubem Okafor), 1978
- Another Africa, 1998
- Collected Poems, 2004
- Refugee Mother And Child
Essays, Criticism and Political Commentary
[dezie | dezie ebe o si]
|
Children's Books
[dezie | dezie ebe o si]
|
|
Ihe Ndị O Meriri
[dezie | dezie ebe o si]- 1972 Commonwealth Poetry Prize
- 1987 Nigerian National Merit Award
- 2002 Peace Prize of the German Book Trade
- 2007 Man Booker International Prize
Lekwazie ndi nke ozo bụ ndi édémédé akwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]- Helon Habila
- Ndi Afrika nke Amerika
- Adaora Lily Ulasi
- Lola Shoneyin
- Chimamanda Ngozi Adichie
- Ndị Igbo
Atụmatụ n'aga n'ezi
[dezie | dezie ebe o si]- Chinua Achebe, Africa’s greatest storyteller, died on March 21st, aged 82, The Economist, asụsụ békè, looked up on 25 Maachị 2016.
References
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Chinua Achebe, African Literary Titan, Dies at 82, The New York Times, 22 Maachị 2013, asụsụ békè, looked up on 25 Maachị 2016.
- ↑ http://uzomediangr.wordpress.com/tag/book/
Wikikwuótu nwe ru kwuótu dị ikwu nye Chinụa Achebe. |
Wikimedia Commons nwe ru media dị ikwu nye Chinua Achebe. |